Aịzaya 12:3
Isaiah 12:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta.
Isaiah 12:3 in English
Isaiah 12:3 · Berean Standard Bible
With joy you will draw water from the springs of salvation,
Context
1Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị,
“Aga m eto gị Onyenwe anyị.
Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe,
ma ugbu a, iwe gị adajụọla;
ị kasịkwara m obi. 2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;
aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.
Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,
ọ ghọrọla m onye nzọpụta.” 3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri
site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị,
“Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya*;
meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ*;
kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu. 5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube.
Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.