Aịzaya 12:2
Isaiah 12:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”
Isaiah 12:2 in English
Isaiah 12:2 · Berean Standard Bible
Surely God is my salvation; I will trust and not be afraid. For the LORD GOD is my strength and my song, and He also has become my salvation.”
Context
1Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị,
“Aga m eto gị Onyenwe anyị.
Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe,
ma ugbu a, iwe gị adajụọla;
ị kasịkwara m obi. 2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;
aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.
Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,
ọ ghọrọla m onye nzọpụta.” 3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri
site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị,
“Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya*;
meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ*;
kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.