Native Bible

Isaiah 12:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”

Isaiah 12:2 in English

Isaiah 12:2 · Berean Standard Bible

Surely God is my salvation; I will trust and not be afraid. For the LORD GOD is my strength and my song, and He also has become my salvation.”

Context

1Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị, “Aga m eto gị Onyenwe anyị. Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe, ma ugbu a, iwe gị adajụọla; ị kasịkwara m obi. 2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m; aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m. Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m, ọ ghọrọla m onye nzọpụta.” 3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmiri site nʼolulu mmiri nke nzọpụta. 4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị, “Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya*; meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ*; kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.