Aịzaya 10:8
Isaiah 10:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’
Isaiah 10:8 in English
Isaiah 10:8 · Berean Standard Bible
“Are not all my commanders kings?” he says.
Context
6Ana m ezipu ya imegide mba a na-amaghị Chineke,
m na-eziga ya imegide ndị na-akpasu m iwe,
ka ha kwakọrọ ihe nkwata nʼagha ha, pụnakwara ha ụfọdụ nʼike,
nakwa ịzọtọ ndị ha niile nʼala dịka apịtị nke okporoụzọ. 7Ma ọ bụghị ihe a ka o zubere,
nke a abụghị ihe ọ na-eche nʼobi ya;
o zubere ịla ndị m nʼiyi,
na ibibi ọtụtụ mba dị iche iche. 8Ọ sịrị, ‘Ndị ọchịagha m niile ha abụghị ndị eze?’ 9‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish?
Hamat ọ dịghị ka Apad;
Sameria ọ dịghịkwa ka Damaskọs? 10Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị,
alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.