Native Bible

Isaiah 10:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Lee na Madmena nọ nʼọsọ, ndị Gebim na-ezo onwe ha.

Isaiah 10:31 in English

Isaiah 10:31 · Berean Standard Bible

Madmenah flees; the people of Gebim take refuge.

Context

29Lee ka ha na-agabiga ụzọ warawara; ha ekpebiela ịnọ ọnọdụ abalị na Geba! Ndị Rema na-ama jijiji, obodo Gibea nke bụ obodo Sọl agbapụla ọsọ ndụ. 30Tienụ mkpu akwa unu ada Galim, geenụ ntị unu ndị Laisha! Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot! 31Lee na Madmena nọ nʼọsọ, ndị Gebim na-ezo onwe ha. 32Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi. 33Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji oke ike gbutuo ngalaba osisi niile. Ọ ga-egbutukwa osisi ndị dị elu, meekwa ka ndị toro ogologo dị ala.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.