Native Bible

Isaiah 10:32 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi.

Isaiah 10:32 in English

Isaiah 10:32 · Berean Standard Bible

Yet today they will halt at Nob, shaking a fist at the mount of Daughter Zion, at the hill of Jerusalem.

Context

30Tienụ mkpu akwa unu ada Galim, geenụ ntị unu ndị Laisha! Leenụ ihe na-adanyere gị, gị Anatot! 31Lee na Madmena nọ nʼọsọ, ndị Gebim na-ezo onwe ha. 32Ndị iro akwụsịla nʼobodo Nob taa; ha na-atụ ugwu Zayọn na Jerusalem aka, na-ekwere ya nʼisi. 33Lee Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji oke ike gbutuo ngalaba osisi niile. Ọ ga-egbutukwa osisi ndị dị elu, meekwa ka ndị toro ogologo dị ala. 34Ya onwe ya ga-egbutu ha niile ka e si eji anyụike egbutu osisi dị nʼoke ọhịa. Lebanọn ga-adakwa nʼihu Onye ahụ dị ike dịka osisi dị nʼoke ọhịa si ada. 10:5 Maọbụ, oke iwe 10:20 Nʼebe a na-ekwu banyere mba Asịrịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.