Native Bible

Isaiah 10:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị, “Unu ndị m, ndị bi na Zayọn, unu atụkwala ndị Asịrịa egwu bụ ndị na-eti unu mkpara igwe, na-ewelikwa mkpọ megide unu dịka ndị Ijipt mere.

Isaiah 10:24 in English

Isaiah 10:24 · Berean Standard Bible

Therefore this is what the Lord GOD of Hosts says: “O My people who dwell in Zion, do not fear Assyria, who strikes you with a rod and lifts his staff against you as the Egyptians did.

Context

22Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi. A kabiela ịla nʼiyi, nke dị oke ukwuu ya na ezi omume. 23E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela na ọ ga-ebibi ala ahụ niile. 24Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị, “Unu ndị m, ndị bi na Zayọn, unu atụkwala ndị Asịrịa egwu bụ ndị na-eti unu mkpara igwe, na-ewelikwa mkpọ megide unu dịka ndị Ijipt mere. 25Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ, ma ọ ga-ebili megide ha, laakwa ha nʼiyi.” 26Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe dịka o sịrị tie ndị Midia ihe na nkume Oreb. Ọ ga-eweli mkpanaka ya nʼelu oke osimiri, ọ ga-eweli ya dịka o mere nʼIjipt.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.