Aịzaya 10:25
Isaiah 10:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ, ma ọ ga-ebili megide ha, laakwa ha nʼiyi.”
Isaiah 10:25 in English
Isaiah 10:25 · Berean Standard Bible
For in just a little while My fury against you will subside, and My anger will turn to their destruction.”
Context
23E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela
na ọ ga-ebibi ala ahụ niile. 24Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị,
“Unu ndị m, ndị bi na Zayọn,
unu atụkwala ndị Asịrịa egwu
bụ ndị na-eti unu mkpara igwe,
na-ewelikwa mkpọ megide unu dịka ndị Ijipt mere. 25Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ,
ma ọ ga-ebili megide ha, laakwa ha nʼiyi.” 26Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji ụtarị tie ha ihe
dịka o sịrị tie ndị Midia ihe na nkume Oreb.
Ọ ga-eweli mkpanaka ya nʼelu oke osimiri,
ọ ga-eweli ya dịka o mere nʼIjipt. 27Nʼụbọchị ahụ, aga m eme ka unu nwere onwe
unu site nʼebe ndị Asịrịa nọ.
Ụdọ igwe ha kenyere unu nʼolu ka m ga-adọbisi,
wezuga ibu arọ unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.