Aịzaya 10:23
Isaiah 10:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela na ọ ga-ebibi ala ahụ niile.
Isaiah 10:23 in English
Isaiah 10:23 · Berean Standard Bible
For the Lord GOD of Hosts will carry out the destruction decreed upon the whole land.*
Context
21Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ
ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu. 22Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri,
ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi.
A kabiela ịla nʼiyi,
nke dị oke ukwuu ya na ezi omume. 23E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela
na ọ ga-ebibi ala ahụ niile. 24Ya mere, ihe a ka Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, sịrị,
“Unu ndị m, ndị bi na Zayọn,
unu atụkwala ndị Asịrịa egwu
bụ ndị na-eti unu mkpara igwe,
na-ewelikwa mkpọ megide unu dịka ndị Ijipt mere. 25Nʼoge na-adịghị anya, iwe m ga-adajụ nʼebe unu nọ,
ma ọ ga-ebili megide ha, laakwa ha nʼiyi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.