Native Bible

Isaiah 10:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu.

Isaiah 10:21 in English

Isaiah 10:21 · Berean Standard Bible

A remnant will return *—a remnant of Jacob— to the Mighty God.

Context

19Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ, ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ. 20Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel, na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb, agaghịkwa adabere nʼonye* ahụ tidara ha, kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel. 21Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu. 22Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi. A kabiela ịla nʼiyi, nke dị oke ukwuu ya na ezi omume. 23E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela na ọ ga-ebibi ala ahụ niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.