Aịzaya 10:21
Isaiah 10:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu.
Isaiah 10:21 in English
Isaiah 10:21 · Berean Standard Bible
A remnant will return *—a remnant of Jacob— to the Mighty God.
Context
19Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ,
ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ. 20Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel,
na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb,
agaghịkwa adabere nʼonye* ahụ
tidara ha,
kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị,
Onye nsọ nke Izrel. 21Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ
ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu. 22Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri,
ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi.
A kabiela ịla nʼiyi,
nke dị oke ukwuu ya na ezi omume. 23E, Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ekpebiela
na ọ ga-ebibi ala ahụ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.