Aịzaya 10:20
Isaiah 10:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel, na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb, agaghịkwa adabere nʼonye* ahụ tidara ha, kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị, Onye nsọ nke Izrel.
Isaiah 10:20 in English
Isaiah 10:20 · Berean Standard Bible
On that day the remnant of Israel and the survivors of the house of Jacob will no longer depend on him who struck them, but they will truly rely on the LORD, the Holy One of Israel.
Context
18A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ
nʼiyi kpamkpam,
dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi. 19Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ,
ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ. 20Nʼụbọchị ahụ, ndị fọdụrụ nʼala Izrel,
na ndị fọdụrụ ndụ nʼụlọ Jekọb,
agaghịkwa adabere nʼonye* ahụ
tidara ha,
kama ha ga-adabere naanị na Onyenwe anyị,
Onye nsọ nke Izrel. 21Ndị fọdụrụ ga-alọghachi, bụ ndị Nke Jekọb fọdụrụ
ga-alọghachikwute Chineke dị ukwuu. 22Ọ bụ ezie na ndị gị Izrel dị ukwuu dịka aja dị nʼakụkụ osimiri,
ọ bụ naanị mmadụ ole na ole ga-alọghachi.
A kabiela ịla nʼiyi,
nke dị oke ukwuu ya na ezi omume.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.