Aịzaya 10:13
Isaiah 10:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ọ na-asị, “ ‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a, ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta. Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche, apụnara m ha akụ ha niile; dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m.
Isaiah 10:13 in English
Isaiah 10:13 · Berean Standard Bible
For he says: ‘By the strength of my hand I have done this, and by my wisdom, for I am clever. I have removed the boundaries of nations and plundered their treasures; like a mighty one I subdued their rulers.
Context
11Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị
dịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’ ” 12Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya. 13Nʼihi na ọ na-asị,
“ ‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a,
ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta.
Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche,
apụnara m ha akụ ha niile;
dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m. 14Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ,
otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche,
dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ,
otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile;
Ọ dịghị onye megharịrị otu nku,
maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’ ” 15Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ,
ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe?
Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu,
maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.