Aịzaya 10:11
Isaiah 10:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị dịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’ ”
Isaiah 10:11 in English
Isaiah 10:11 · Berean Standard Bible
and as I have done to Samaria and its idols, will I not also do to Jerusalem and her idols?”
Context
9‘Ọnọdụ Kalno ọ dịghị ka nke Kakemish?
Hamat ọ dịghị ka Apad;
Sameria ọ dịghịkwa ka Damaskọs? 10Dịka aka m si chịkọta alaeze dị iche iche nke ọtụtụ arụsị,
alaeze dị iche iche nke arụsị apịrị apị ha karịrị nke Jerusalem na Sameria. 11Ọ bụ na m agaghị emekwa Jerusalem na arụsị ya niile apịrị apị
dịka m mere Sameria na arụsị ya niile?’ ” 12Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya. 13Nʼihi na ọ na-asị,
“ ‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a,
ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta.
Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche,
apụnara m ha akụ ha niile;
dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.