Aịzaya 10:14
Isaiah 10:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ, otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche, dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ, otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile; Ọ dịghị onye megharịrị otu nku, maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’ ”
Isaiah 10:14 in English
Isaiah 10:14 · Berean Standard Bible
My hand reached as into a nest to seize the wealth of the nations. Like one gathering abandoned eggs, I gathered all the earth. No wing fluttered, no beak opened or chirped.’”
Context
12Mgbe Onyenwe anyị rụsịrị ọrụ ya niile megide ugwu Zayọn na Jerusalem, ọ ga-asị, “Aga m ata eze ndị Asịrịa ahụhụ nʼihi nganga nke obi ha, na ịnya isi nke anya mpako ya. 13Nʼihi na ọ na-asị,
“ ‘Ọ bụ site nʼike aka m, ka m ji mee nke a,
ọ bụkwa na amamihe m, nʼihi na m nwere nghọta.
Ewezugara m oke ala mba niile dị iche iche,
apụnara m ha akụ ha niile;
dịka onye dị ike, e wedara m ndị eze ha niile nʼokpuru m. 14Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ,
otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche,
dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ,
otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile;
Ọ dịghị onye megharịrị otu nku,
maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’ ” 15Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ,
ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe?
Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu,
maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi. 16Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti;
ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya
dịka ire ọkụ nke na-ere ere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.