Aịzaya 10:16
Isaiah 10:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti; ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya dịka ire ọkụ nke na-ere ere.
Isaiah 10:16 in English
Isaiah 10:16 · Berean Standard Bible
Therefore the Lord GOD of Hosts will send a wasting disease among Assyria’s stout warriors, and under his pomp will be kindled a fire like a burning flame.
Context
14Dịka mmadụ si agbatị aka nʼime akwụ nnụnụ,
otu a ka m chịkọtara akụnụba mba dị iche iche,
dịka mmadụ si achịkọta akwa ahapụrụ ahapụ,
otu a ka m chịkọtara mba ụwa niile;
Ọ dịghị onye megharịrị otu nku,
maọbụ saghee ọnụ ya ime mkpọtụ!’ ” 15Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ,
ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe?
Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu,
maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi. 16Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti;
ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya
dịka ire ọkụ nke na-ere ere. 17Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ,
Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi.
Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ
ogwu niile na uke niile ọkụ. 18A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ
nʼiyi kpamkpam,
dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.