Aịzaya 10:17
Isaiah 10:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ, Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi. Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ ogwu niile na uke niile ọkụ.
Isaiah 10:17 in English
Isaiah 10:17 · Berean Standard Bible
And the Light of Israel will become a fire, and its Holy One a flame. In a single day it will burn and devour Assyria’s thorns and thistles.
Context
15Anyụike ọ ga-anya isi sị na ya dị ukwuu karịa onye na-eji ya awa nkụ,
ka ọ bụ mma nkwọ, ọ ga-aja onwe ya karịa onye na-eji ya akpọwa ihe?
Dịka a ga-asị na okporo igwe ga-ebuli onye na-eweli ya elu,
maọbụ mkpọ ọ ga-efegharị onye na-abụghị osisi. 16Nʼihi ya, Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
ga-ezitere ndị agha gị mara abụba ihe otiti;
ọ ga-akwanye ọkụ nʼokpuru ihe ngosipụta nke ịdị ebube ya
dịka ire ọkụ nke na-ere ere. 17Ìhè nke Izrel, ga-aghọ ọkụ,
Onye nsọ ha, ga-aghọkwa ire ọkụ nke ga-ala ihe niile nʼiyi.
Nʼotu abalị ka ọ ga-erechapụ
ogwu niile na uke niile ọkụ. 18A ga-ala ịma mma nke oke ọhịa ya na ala ya na-amị ezi mkpụrụ
nʼiyi kpamkpam,
dịka mgbe ọrịa na-ala mmadụ nʼiyi. 19Naanị osisi ole na ole ga-afọdụ,
ha ga-adị ntakịrị ruo na nwantakịrị nwere ike gụọ ha ọnụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.