Aịzaya 1:7
Isaiah 1:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ala unu tọgbọrọ nʼefu, agbaakwala obodo unu ọkụ. Ndị mbịarambịa ewerechaala ihe dị nʼubi unu nʼihu unu, ha emeela ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka mgbe onye ọbịa kpochapụrụ ihe dị nʼime ya.*
Isaiah 1:7 in English
Isaiah 1:7 · Berean Standard Bible
Your land is desolate; your cities are burned with fire. Foreigners devour your fields before you— a desolation demolished by strangers.
Context
5Gịnị mere a ga-eji nọgide na-eti unu ihe?
Gịnị mere unu ji nọgide na nnupu isi?
Lee ọnya juru unu isi,
leekwa na ọrịa na-arịa obi unu. 6O nweghị akụkụ ahụ unu zuruoke,
site nʼọbọ ụkwụ unu ruo nʼopi isi unu;
ọnya, na ntihịa ahụ,
na ọnya mmerụ ahụ, jupụtara unu nʼahụ;
e kechikwaghị ha,
e tekwaghị ha mmanụ. 7Ala unu tọgbọrọ nʼefu,
agbaakwala obodo unu ọkụ.
Ndị mbịarambịa ewerechaala ihe dị nʼubi unu
nʼihu unu,
ha emeela ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka mgbe onye ọbịa kpochapụrụ ihe dị nʼime ya.* 8Ada Zayọn ka a hapụrụ
dịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị,
dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba,
dịka obodo ndị iro gbara gburugburu. 9Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
emeghị ka mmadụ ole na ole fọdụ ndụ nʼime anyị,
anyị gara adị ka Sọdọm,
anyị gaara adịkwa ka Gọmọra.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.