Aịzaya 1:5
Isaiah 1:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị mere a ga-eji nọgide na-eti unu ihe? Gịnị mere unu ji nọgide na nnupu isi? Lee ọnya juru unu isi, leekwa na ọrịa na-arịa obi unu.
Isaiah 1:5 in English
Isaiah 1:5 · Berean Standard Bible
Why do you want more beatings? Why do you keep rebelling? Your head has a massive wound, and your whole heart is afflicted.
Context
3Ehi maara onyenwe ya,
ịnyịnya ibu makwaara ebe onyenwe ya na-anọ azụ ya nri,
ma Izrel amaghị m,
ndị m adịghị aghọtakwa.” 4Ahụhụ dịrị mba ndị mmehie,
ndị ajọ omume riri ahụ,
ụmụ ndị ajọ omume,
ụmụ ndị nyefere onwe ha na mmerụ!
Ha agbakụtala Onyenwe anyị azụ,
ha elelịala Onye dị Nsọ nke Izrel,
ha agbakụtala ya azụ ha. 5Gịnị mere a ga-eji nọgide na-eti unu ihe?
Gịnị mere unu ji nọgide na nnupu isi?
Lee ọnya juru unu isi,
leekwa na ọrịa na-arịa obi unu. 6O nweghị akụkụ ahụ unu zuruoke,
site nʼọbọ ụkwụ unu ruo nʼopi isi unu;
ọnya, na ntihịa ahụ,
na ọnya mmerụ ahụ, jupụtara unu nʼahụ;
e kechikwaghị ha,
e tekwaghị ha mmanụ. 7Ala unu tọgbọrọ nʼefu,
agbaakwala obodo unu ọkụ.
Ndị mbịarambịa ewerechaala ihe dị nʼubi unu
nʼihu unu,
ha emeela ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka mgbe onye ọbịa kpochapụrụ ihe dị nʼime ya.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.