Aịzaya 1:8
Isaiah 1:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ada Zayọn ka a hapụrụ dịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị, dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba, dịka obodo ndị iro gbara gburugburu.
Isaiah 1:8 in English
Isaiah 1:8 · Berean Standard Bible
And the Daughter of Zion is abandoned like a shelter in a vineyard, like a shack in a cucumber field, like a city besieged.
Context
6O nweghị akụkụ ahụ unu zuruoke,
site nʼọbọ ụkwụ unu ruo nʼopi isi unu;
ọnya, na ntihịa ahụ,
na ọnya mmerụ ahụ, jupụtara unu nʼahụ;
e kechikwaghị ha,
e tekwaghị ha mmanụ. 7Ala unu tọgbọrọ nʼefu,
agbaakwala obodo unu ọkụ.
Ndị mbịarambịa ewerechaala ihe dị nʼubi unu
nʼihu unu,
ha emeela ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka mgbe onye ọbịa kpochapụrụ ihe dị nʼime ya.* 8Ada Zayọn ka a hapụrụ
dịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị,
dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba,
dịka obodo ndị iro gbara gburugburu. 9Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
emeghị ka mmadụ ole na ole fọdụ ndụ nʼime anyị,
anyị gara adị ka Sọdọm,
anyị gaara adịkwa ka Gọmọra. 10Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị,
unu ndị na-achị Sọdọm;
geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị,
unu ndị Gọmọra.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.