Aịzaya 1:10
Isaiah 1:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-achị Sọdọm; geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị, unu ndị Gọmọra.
Isaiah 1:10 in English
Isaiah 1:10 · Berean Standard Bible
Hear the word of the LORD, you rulers of Sodom; listen to the instruction of our God, you people of Gomorrah!
Context
8Ada Zayọn ka a hapụrụ
dịka ụlọ nche dị nʼubi vaịnị,
dịka ụlọ nta dị nʼubi kukumba,
dịka obodo ndị iro gbara gburugburu. 9Ọ bụrụ na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
emeghị ka mmadụ ole na ole fọdụ ndụ nʼime anyị,
anyị gara adị ka Sọdọm,
anyị gaara adịkwa ka Gọmọra. 10Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị,
unu ndị na-achị Sọdọm;
geenụ ntị nʼozizi Chineke anyị,
unu ndị Gọmọra. 11“Nʼihi gịnị ka unu ji na-achụrụ m ọtụtụ aja,
gịnị ka ihe ndị a bụ nye m?”
ka Onyenwe anyị sịrị.
“Afọ ejula m nʼaja nsure ọkụ niile
nke eji ebule na anụmanụ e mere ka ha gbaa abụba chụọ;
Ọbara oke ehi na nke ụmụ atụrụ na mkpi
adịghị atọkwa m ụtọ. 12Mgbe unu na-abịa ka ahụ unu nʼihu m,
onye chọrọ nke a nʼaka unu?
Kwụsịnụ ịzọtọ ogige m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.