Aịzaya 1:19
Isaiah 1:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi, aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a.
Isaiah 1:19 in English
Isaiah 1:19 · Berean Standard Bible
If you are willing and obedient, you will eat the best of the land.
Context
17Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi,
nyerenụ ndị a na-emegbu aka.
Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ,
ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ. 18“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,”
bụ ihe Onyenwe anyị na-asị.
“A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie,
ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe,*
a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie,
ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha. 19Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi,
aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a. 20Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi,
ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.”
Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya. 21Lee ka obodo ahụ kwesiri ntụkwasị obi
aghọọla onye akwụna!
Ọ bụ nke jupụtararị nʼikpe ziri ezi;
ezi omume na-anọbu nʼime ya,
ma ugbu a, ọ bụzi ndị ogbu mmadụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.