Aịzaya 1:18
Isaiah 1:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,” bụ ihe Onyenwe anyị na-asị. “A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie, ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe,* a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie, ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha.
Isaiah 1:18 in English
Isaiah 1:18 · Berean Standard Bible
“Come now, let us reason together,” says the LORD. “Though your sins are like scarlet, they will be as white as snow; though they are as red as crimson, they will become like wool.
Context
16Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha.
Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m;
kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma. 17Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi,
nyerenụ ndị a na-emegbu aka.
Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ,
ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ. 18“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,”
bụ ihe Onyenwe anyị na-asị.
“A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie,
ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe,*
a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie,
ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha. 19Ọ bụrụ na unu ga-ekwenye, ọ bụrụ na unu ga-erubere m isi,
aga m eme ka unu nwee ezi ihe nke unu ga-eri nʼala a. 20Ma ọ bụrụ na unu ajụ ma nupu isi,
ọ bụ mma agha ka a ga-eji gbuchapụ unu.”
Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwula ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.