Aịzaya 1:16
Isaiah 1:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha. Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m; kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma.
Isaiah 1:16 in English
Isaiah 1:16 · Berean Standard Bible
Wash and cleanse yourselves. Remove your evil deeds from My sight. Stop doing evil!
Context
14Mkpụrụobi m kpọrọ mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme unu ndị ọzọ
a kara aka asị.
Ha bụụrụ m ibu arọ,
ike agwụkwala m ibu ha. 15Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere,
agaghị m aṅa unu ntị;
ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere,
agaghị m aṅa ntị.”
Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara! 16Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha.
Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m;
kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma. 17Mụtanụ otu e si eme ihe ziri ezi; chọọnụ ikpe ziri ezi,
nyerenụ ndị a na-emegbu aka.
Werenụ ọnọdụ nna nʼebe ndị na-enweghị nna nọ,
ma kwuchitenụ ọnụ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ. 18“Bịanụ ka anyị kparịtaa ụka,”
bụ ihe Onyenwe anyị na-asị.
“A sịkwarị na mmehie unu dị ka uwe uhie,
ha ga-adị ọcha dịka akụmmiri igwe,*
a sịkwa na ha dị uhie uhie dịka ogho uhie,
ha ga-adịkwa ka ajị anụ ọcha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.