Aịzaya 1:14
Isaiah 1:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mkpụrụobi m kpọrọ mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme unu ndị ọzọ a kara aka asị. Ha bụụrụ m ibu arọ, ike agwụkwala m ibu ha.
Isaiah 1:14 in English
Isaiah 1:14 · Berean Standard Bible
I hate your New Moons and your appointed feasts. They have become a burden to Me; I am weary of bearing them.
Context
12Mgbe unu na-abịa ka ahụ unu nʼihu m,
onye chọrọ nke a nʼaka unu?
Kwụsịnụ ịzọtọ ogige m. 13Kwụsị iweta onyinye niile na-enweghị isi.
Ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ unu bụrụ m ihe arụ.
Mmemme ọnwa ọhụrụ, na nke ụbọchị izuike, na nzukọta unu niile,
apụghị m ịnagide mkpọkọta unu nke na-abaghị uru. 14Mkpụrụobi m kpọrọ mmemme ọnwa ọhụrụ, na mmemme unu ndị ọzọ
a kara aka asị.
Ha bụụrụ m ibu arọ,
ike agwụkwala m ibu ha. 15Mgbe unu na-agbasa aka unu nʼekpere,
agaghị m aṅa unu ntị;
ọ bụladị mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere,
agaghị m aṅa ntị.”
Nʼihi na aka unu jupụtara nʼọbara! 16Sachapụnụ onwe unu, dịkwanụ ọcha.
Wezuganụ ajọ omume unu niile site nʼihu m;
kwụsịnụ ime ihe na-adịghị mma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.