Hosiya 6:3
Hosea 6:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka anyị mara Onyenwe anyị; ka anyị gbalịsie ike ịmata ya. Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite, nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ, ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo, dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.”
Hosea 6:3 in English
Hosea 6:3 · Berean Standard Bible
So let us know— let us press on to know the LORD. As surely as the sun rises, He will appear; He will come to us like the rain, like the spring showers that water the earth.
Context
1“Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị.
Ya onwe ya adọkaala anyị,
ọ ga-agwọkwa anyị;
o tipụla anyị ọnya,
ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị. 2Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị.
Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị,
meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya. 3Ka anyị mara Onyenwe anyị;
ka anyị gbalịsie ike ịmata ya.
Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite,
nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ,
ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo,
dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.” 4“Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem?
Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda?
Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ,
dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta. 5Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha.
Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha,
ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.