Hosiya 6:5
Hosea 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha. Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha, ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.
Hosea 6:5 in English
Hosea 6:5 · Berean Standard Bible
Therefore I have hewn them by the prophets; I have slain them by the words of My mouth, and My judgments go forth like lightning.
Context
3Ka anyị mara Onyenwe anyị;
ka anyị gbalịsie ike ịmata ya.
Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite,
nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ,
ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo,
dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.” 4“Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem?
Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda?
Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ,
dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta. 5Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha.
Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha,
ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè. 6Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja,
ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile. 7Ma dịka Adam, ha emebiela ọgbụgba ndụ m;
nʼebe ahụ ka ha nọ gosi ekwesighị ntụkwasị obi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.