Hosiya 6:4
Hosea 6:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem? Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda? Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ, dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.
Hosea 6:4 in English
Hosea 6:4 · Berean Standard Bible
What shall I do with you, O Ephraim *? What shall I do with you, O Judah? For your loyalty is like a morning mist, like the early dew that vanishes.
Context
2Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị.
Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị,
meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya. 3Ka anyị mara Onyenwe anyị;
ka anyị gbalịsie ike ịmata ya.
Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite,
nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ,
ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo,
dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.” 4“Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem?
Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda?
Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ,
dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta. 5Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha.
Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha,
ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè. 6Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja,
ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.