Hosiya 6:2
Hosea 6:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị. Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị, meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.
Hosea 6:2 in English
Hosea 6:2 · Berean Standard Bible
After two days He will revive us; on the third day He will raise us up, that we may live in His presence.
Context
1“Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị.
Ya onwe ya adọkaala anyị,
ọ ga-agwọkwa anyị;
o tipụla anyị ọnya,
ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị. 2Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị.
Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị,
meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya. 3Ka anyị mara Onyenwe anyị;
ka anyị gbalịsie ike ịmata ya.
Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite,
nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ,
ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo,
dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.” 4“Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem?
Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda?
Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ,
dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.