Hosiya 2:9
Hosea 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara, na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru. Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m, nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya.
Hosea 2:9 in English
Hosea 2:9 · Berean Standard Bible
Therefore I will take back My grain in its time and My new wine in its season; I will take away My wool and linen, which were given to cover her nakedness.
Context
7Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha.
Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha.
Mgbe ahụ, ọ ga-asị,
‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m,
nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’ 8Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m,
na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv,
na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile
nke o ji na-efe Baal. 9“Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara,
na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru.
Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m,
nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya. 10Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya
nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,*
ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m. 11Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị;
ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ,
nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.