Hosiya 2:10
Hosea 2:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,* ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.
Hosea 2:10 in English
Hosea 2:10 · Berean Standard Bible
And then I will expose her lewdness in the sight of her lovers, and no one will deliver her out of My hands.
Context
8Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m,
na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv,
na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile
nke o ji na-efe Baal. 9“Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara,
na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru.
Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m,
nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya. 10Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya
nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,*
ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m. 11Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị;
ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ,
nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka. 12Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi,
nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya;
aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa,
anụ ọhịa ga-eripịa ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.