Native Bible

Hosea 2:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m, na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv, na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile nke o ji na-efe Baal.

Hosea 2:8 in English

Hosea 2:8 · Berean Standard Bible

For she does not acknowledge that it was I who gave her grain, new wine, and oil, who lavished on her silver and gold— which they crafted for Baal.

Context

6Nʼihi nke a, aga m eji ogwu na uke gbachie ya gburugburu; aga m agbachi ụzọ ya, mee ya ka ọ ghara ịma ebe ọ na-eje. 7Ọ ga-agbaso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya ma ọ gaghị achụkwute ha. Ọ ga-achọ ha ma ọ gaghị ahụ ha. Mgbe ahụ, ọ ga-asị, ‘Ka m gaa laghachikwuru di mbụ m, nʼihi na ọ dịrị m mma mgbe ahụ karịa ugbu a.’ 8Ma ọ kwetaghị na ihe ndị a si nʼaka m, na ọ bụ mụ nyere ya ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ oliv, na ọlaọcha, na ọlaedo ndị ahụ niile nke o ji na-efe Baal. 9“Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara, na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru. Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m, nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya. 10Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,* ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.