Hosiya 2:11
Hosea 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị; ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ, nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka.
Hosea 2:11 in English
Hosea 2:11 · Berean Standard Bible
I will put an end to all her exultation: her feasts, New Moons, and Sabbaths— all her appointed feasts.
Context
9“Ya mere, aga m ewerekwa ọka m mgbe ọ chara,
na mmanya ọhụrụ m mgbe oge ya ruru.
Aga m anapụkwa ya akwa ajị anụ m na akwa ọcha m,
nke ekwesiri iji kpuchie ọtọ ya. 10Ugbu a, aga m ekpughe ọtọ ya
nʼihu ndị ahụ na-ahụ ya nʼanya,*
ọ dịkwaghị onye nwere ike ịnapụta ya site nʼaka m. 11Aga m eme ka obi ụtọ ya kwụsị;
ọ bụladị mmemme nke afọ niile, mmemme ọnwa ọhụrụ,
nke ụbọchị izuike na mmemme ndị ọzọ ahụ niile a kara aka. 12Aga m ala ubi vaịnị ya na osisi fiig ya niile nʼiyi,
nke ọ sịrị bụ ụgwọ ọrụ ya site nʼaka ndị hụrụ ya nʼanya;
aga m emekwa ka ha ghọọ oke ọhịa,
anụ ọhịa ga-eripịa ha. 13Aga m enye ya ahụhụ maka ụbọchị niile
bụ nke o surere ihe na-esi isi ụtọ nye chi Baal niile,
ọ chịrị mgbaaka mkpịsịaka na ihe ịchọ mma niile, jikere onwe ya,
pụọ chụso ndị ahụ hụrụ ya nʼanya,
ma chezọọ m,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.