Hosiya 14:7
Hosea 14:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m. Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ. Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị, a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn.
Hosea 14:7 in English
Hosea 14:7 · Berean Standard Bible
They will return and dwell in his shade; they will grow grain and blossom like the vine. His renown will be like the wine of Lebanon.
Context
5Aga m adịrị Izrel dịka igirigi.
Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili.
Dịka osisi sida nke Lebanọn,
mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala; 6ome ya ga-awasa,
ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv,
isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn. 7Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m.
Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ.
Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị,
a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn. 8Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ?
Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya.
Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ.
Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.” 9Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a.
Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara.
Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ.
Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha,
ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.