Native Bible

Hosea 14:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m. Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ. Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị, a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn.

Hosea 14:7 in English

Hosea 14:7 · Berean Standard Bible

They will return and dwell in his shade; they will grow grain and blossom like the vine. His renown will be like the wine of Lebanon.

Context

5Aga m adịrị Izrel dịka igirigi. Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili. Dịka osisi sida nke Lebanọn, mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala; 6ome ya ga-awasa, ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv, isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn. 7Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m. Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ. Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị, a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn. 8Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ? Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya. Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ. Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.” 9Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a. Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara. Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ. Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha, ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.