Hosiya 14:9
Hosea 14:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a. Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara. Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ. Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha, ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.
Hosea 14:9 in English
Hosea 14:9 · Berean Standard Bible
Whoever is wise, let him understand these things; whoever is discerning, let him know them. For the ways of the LORD are right, and the righteous walk in them but the rebellious stumble in them.
Context
7Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m.
Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ.
Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị,
a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn. 8Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ?
Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya.
Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ.
Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.” 9Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a.
Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara.
Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ.
Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha,
ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.