Hosiya 14:8
Hosea 14:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ? Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya. Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ. Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.”
Hosea 14:8 in English
Hosea 14:8 · Berean Standard Bible
O Ephraim,* what have I to do anymore with idols? It is I who answer and watch over him. I am like a flourishing cypress;* your fruit comes from Me.
Context
6ome ya ga-awasa,
ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv,
isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn. 7Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m.
Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ.
Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị,
a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn. 8Gị Ifrem, gịnị ka mụ na arụsị nwekọrọ?
Mụ onwe m ga-aza ya, ma lekọtakwa ya.
Mụ onwe m dịkwa ka osisi junipa dị ndụ.
Ịmị mkpụrụ gị na-esitekwa nʼebe m nọ abịa.” 9Onye bụ onye amamihe? Ha ga-aghọta ihe ndị a.
Onye bụ onye nwere uche nghọta? Ha ga-aghọta ihe ọ pụtara.
Nʼihi na ụzọ Onyenwe anyị bụ ezi ụzọ.
Ndị ezi omume na-ejekwa ije na ha,
ma ndị na-enupu isi na-asọ ngọngọ nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.