Hosiya 14:5
Hosea 14:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m adịrị Izrel dịka igirigi. Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili. Dịka osisi sida nke Lebanọn, mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala;
Hosea 14:5 in English
Hosea 14:5 · Berean Standard Bible
I will be like the dew to Israel; he will blossom like the lily and take root like the cedars of Lebanon.
Context
3Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị,
ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị.
Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’
nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa,
nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.” 4“Aga m agwọ ndaghachi azụ ha,
jiri obi m niile hụ ha nʼanya,
nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa. 5Aga m adịrị Izrel dịka igirigi.
Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili.
Dịka osisi sida nke Lebanọn,
mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala; 6ome ya ga-awasa,
ịma mma ya ga-adịkwa ka osisi oliv,
isisi ọma ọ na-esi ga-adị ka isi osisi sida nke Lebanọn. 7Ha ga-ebi nʼokpuru ndo m.
Ha ga-etolite dịka osisi ọka dị ndụ.
Ha ga-ama ifuru dịka osisi ubi vaịnị,
a ga-amatakwa ha nʼebe niile dịka e si mara mmanya e mere na Lebanọn.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.