Hosiya 14:3
Hosea 14:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị, ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị. Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’ nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa, nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.”
Hosea 14:3 in English
Hosea 14:3 · Berean Standard Bible
Assyria will not save us, nor will we ride on horses. We will never again say, ‘Our gods!’ to the work of our own hands. For in You the fatherless find compassion.”
Context
1Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel;
nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ. 2Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu
lọghachikwute Onyenwe anyị.
Gwanụ ya sị,
“Gbaghara mmehie anyị niile,
jirikwa ihuọma nabata anyị,
ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja. 3Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị,
ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị.
Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’
nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa,
nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.” 4“Aga m agwọ ndaghachi azụ ha,
jiri obi m niile hụ ha nʼanya,
nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa. 5Aga m adịrị Izrel dịka igirigi.
Ọ ga-amakwa ifuru dịka okoko lili.
Dịka osisi sida nke Lebanọn,
mgbọrọgwụ ya ga-abami nʼime ala;
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.