Native Bible

Hosea 14:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu lọghachikwute Onyenwe anyị. Gwanụ ya sị, “Gbaghara mmehie anyị niile, jirikwa ihuọma nabata anyị, ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja.

Hosea 14:2 in English

Hosea 14:2 · Berean Standard Bible

Bring your confessions and return to the LORD. Say to Him: “Take away all our iniquity and receive us graciously, that we may present the fruit of our lips.*

Context

1Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel; nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ. 2Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu lọghachikwute Onyenwe anyị. Gwanụ ya sị, “Gbaghara mmehie anyị niile, jirikwa ihuọma nabata anyị, ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja. 3Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị, ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị. Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’ nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa, nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.” 4“Aga m agwọ ndaghachi azụ ha, jiri obi m niile hụ ha nʼanya, nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.