Hosiya 14:2
Hosea 14:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu lọghachikwute Onyenwe anyị. Gwanụ ya sị, “Gbaghara mmehie anyị niile, jirikwa ihuọma nabata anyị, ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja.
Hosea 14:2 in English
Hosea 14:2 · Berean Standard Bible
Bring your confessions and return to the LORD. Say to Him: “Take away all our iniquity and receive us graciously, that we may present the fruit of our lips.*
Context
1Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel;
nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ. 2Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu
lọghachikwute Onyenwe anyị.
Gwanụ ya sị,
“Gbaghara mmehie anyị niile,
jirikwa ihuọma nabata anyị,
ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja. 3Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị,
ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị.
Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’
nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa,
nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.” 4“Aga m agwọ ndaghachi azụ ha,
jiri obi m niile hụ ha nʼanya,
nʼihi na iwe m esitela nʼebe ha nọ chigharịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.