Hosiya 14:1
Hosea 14:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel; nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ.
Hosea 14:1 in English
Hosea 14:1 · Berean Standard Bible
Return, O Israel, to the LORD your God, for you have stumbled by your iniquity.
Context
1Lọghachikwutenụ Onyenwe anyị Chineke unu, unu ndị Izrel;
nʼihi na ọ bụ mmehie unu wetaara unu ịsọ ngọngọ. 2Chịrịnụ okwu nʼọnụ unu
lọghachikwute Onyenwe anyị.
Gwanụ ya sị,
“Gbaghara mmehie anyị niile,
jirikwa ihuọma nabata anyị,
ka anyị si otu a jiri egbugbere ọnụ anyị chụọrọ gị aja. 3Ndị Asịrịa enweghị ike ịzọpụta anyị,
ọ bụghị nʼelu ịnyịnya agha ka anyị ga-anọkwasị.
Anyị agaghị asịkwa ‘Chi anyị ka unu bụ’
nye ihe ndị ahụ anyị jiri aka anyị pịa,
nʼihi na nʼime gị, ka ndị na-enweghị nne na nna na-achọta obi ebere.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.