Hosiya 12:4
Hosea 12:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E, ya na mmụọ ozi gbara mgba. Nʼoge ahụ, o jidesiri ya aka ike, kwaa akwa, rịọọ ngọzị site nʼaka ya. Ọ hụrụ ya na Betel, gwaakwa ya okwu,
Hosea 12:4 in English
Hosea 12:4 · Berean Standard Bible
Yes, he struggled with the angel * and prevailed; he wept and sought His favor; he found Him at Bethel and spoke with Him there *—
Context
2Onyenwe anyị na-akpọ Juda ikpe.
Ọ ga-ata Jekọb* ahụhụ dịka ụzọ ya si dị,
kwụghachikwa ya dịka omume ya si dị. 3Mgbe ọ nọ nʼafọ nne ya ka o jidere nwanne ya nwoke nʼikiri ụkwụ.
Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ya na Chineke gbara mgba. 4E, ya na mmụọ ozi gbara mgba.
Nʼoge ahụ, o jidesiri ya aka ike, kwaa akwa, rịọọ ngọzị site nʼaka ya.
Ọ hụrụ ya na Betel,
gwaakwa ya okwu, 5Onyenwe anyị Chineke onye pụrụ ime ihe niile,
Onyenwe anyị bụ aha ya. 6Ịghaghị ịlọghachikwute Chineke gị,
guzosie ike nʼịhụnanya na ikpe ziri ezi,
na-elekwa anya Chineke gị mgbe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.