Hosiya 12:3
Hosea 12:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ nọ nʼafọ nne ya ka o jidere nwanne ya nwoke nʼikiri ụkwụ. Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ya na Chineke gbara mgba.
Hosea 12:3 in English
Hosea 12:3 · Berean Standard Bible
In the womb he grasped his brother’s heel, and in his vigor he wrestled with God.
Context
1Akaọrụ Ifrem bụ naanị ịchụso ikuku,
ọ na-achụso ikuku si nʼọwụwa anyanwụ bido nʼụtụtụ ruo nʼabalị.
Otu a ka ha si eme ka ịgha ụgha, na ime ihe ike na-abawanye ụba.
Ha na Asịrịa na-agbakwa ndụ,
ha na-ebugakwa mmanụ nʼIjipt. 2Onyenwe anyị na-akpọ Juda ikpe.
Ọ ga-ata Jekọb* ahụhụ dịka ụzọ ya si dị,
kwụghachikwa ya dịka omume ya si dị. 3Mgbe ọ nọ nʼafọ nne ya ka o jidere nwanne ya nwoke nʼikiri ụkwụ.
Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ya na Chineke gbara mgba. 4E, ya na mmụọ ozi gbara mgba.
Nʼoge ahụ, o jidesiri ya aka ike, kwaa akwa, rịọọ ngọzị site nʼaka ya.
Ọ hụrụ ya na Betel,
gwaakwa ya okwu, 5Onyenwe anyị Chineke onye pụrụ ime ihe niile,
Onyenwe anyị bụ aha ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.