Native Bible

Hosea 12:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị na-akpọ Juda ikpe. Ọ ga-ata Jekọb* ahụhụ dịka ụzọ ya si dị, kwụghachikwa ya dịka omume ya si dị.

Hosea 12:2 in English

Hosea 12:2 · Berean Standard Bible

The LORD also brings a charge against Judah. He will punish Jacob * according to his ways and repay him according to his deeds.

Context

1Akaọrụ Ifrem bụ naanị ịchụso ikuku, ọ na-achụso ikuku si nʼọwụwa anyanwụ bido nʼụtụtụ ruo nʼabalị. Otu a ka ha si eme ka ịgha ụgha, na ime ihe ike na-abawanye ụba. Ha na Asịrịa na-agbakwa ndụ, ha na-ebugakwa mmanụ nʼIjipt. 2Onyenwe anyị na-akpọ Juda ikpe. Ọ ga-ata Jekọb* ahụhụ dịka ụzọ ya si dị, kwụghachikwa ya dịka omume ya si dị. 3Mgbe ọ nọ nʼafọ nne ya ka o jidere nwanne ya nwoke nʼikiri ụkwụ. Mgbe ọ ghọrọ dimkpa, ya na Chineke gbara mgba. 4E, ya na mmụọ ozi gbara mgba. Nʼoge ahụ, o jidesiri ya aka ike, kwaa akwa, rịọọ ngọzị site nʼaka ya. Ọ hụrụ ya na Betel, gwaakwa ya okwu,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.