Habakuk 3:16
Habakkuk 3:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile, egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu, ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure, mee ka ụkwụ m maa jijiji. Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha.
Habakkuk 3:16 in English
Habakkuk 3:16 · Berean Standard Bible
I heard and trembled within; my lips quivered at the sound. Decay entered my bones; I trembled where I stood. Yet I must wait patiently for the day of distress to come upon the people who invade us.
Context
14Ọ bụ ùbe ya ka i ji mawaa ya isi,
mgbe ndị dike nʼagha ya bịara dịka oke ifufe ịchụsa anyị,
mgbe ha si nʼobi ụtọ ha chee na ha na-aga iripịa ndị ogbenye e wedara nʼala,
bụ ndị na-ezo onwe ha. 15Ị chịrịla ịnyịnya gị zọọ ije nʼoke osimiri,
kpagharịa mmiri ukwu ndị ahụ. 16Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile,
egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu,
ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure,
mee ka ụkwụ m maa jijiji.
Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ
nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha. 17A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru,
na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị,
a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata
na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri,
a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ,
na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ, 18mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.