Habakuk 3:18
Habakkuk 3:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị. Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m.
Habakkuk 3:18 in English
Habakkuk 3:18 · Berean Standard Bible
yet I will exult in the LORD; I will rejoice in the God of my salvation!
Context
16Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile,
egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu,
ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure,
mee ka ụkwụ m maa jijiji.
Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ
nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha. 17A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru,
na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị,
a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata
na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri,
a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ,
na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ, 18mụ onwe m ga-anọgide na-aṅụrị ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
Aga m etegharịkwa egwu ọṅụ nʼime Chineke Onye nzọpụta m. 19Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ ike m,
ọ na-eme ụkwụ m abụọ ka ha dịka nke ele.*
Ọ na-emekwa ka m zọọ ije nʼebe niile dị elu.
Nke a dịrị onyeisi abụ, nʼụbọ akwara m dị iche iche.
3:19 Ịdị ngwa nʼịgba ọsọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.