Habakuk 3:15
Habakkuk 3:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị chịrịla ịnyịnya gị zọọ ije nʼoke osimiri, kpagharịa mmiri ukwu ndị ahụ.
Habakkuk 3:15 in English
Habakkuk 3:15 · Berean Standard Bible
You trampled the sea with Your horses, churning the great waters.
Context
13Ị pụtara ịzọpụta ndị gị,
ịzọpụta onye ahụ i tere mmanụ.
Ị zọpịara isi onyendu nke ala ajọ omume ahụ,
gbawa ya ọtọ site nʼisi ruo nʼụkwụ. 14Ọ bụ ùbe ya ka i ji mawaa ya isi,
mgbe ndị dike nʼagha ya bịara dịka oke ifufe ịchụsa anyị,
mgbe ha si nʼobi ụtọ ha chee na ha na-aga iripịa ndị ogbenye e wedara nʼala,
bụ ndị na-ezo onwe ha. 15Ị chịrịla ịnyịnya gị zọọ ije nʼoke osimiri,
kpagharịa mmiri ukwu ndị ahụ. 16Amara m jijiji nʼobi m mgbe m nụrụ ihe ndị a niile,
egbugbere ọnụ m abụọ kụkọtara nʼegwu,
ọkpụkpụ dị m nʼahụ malitere ire ure,
mee ka ụkwụ m maa jijiji.
Ma aga m eji ndidi chere ụbọchị ọjọọ ahụ
nke ga-abịakwasị ndị ahụ na-abịa ibuso anyị agha. 17A sịkwarị na osisi fiig amaghị ifuru,
na ọ dịghị mkpụrụ dị nʼosisi vaịnị,
a sịkwa na mkpụrụ osisi oliv ebilata
na ala ubi niile emepụtaghị ihe oriri,
a sịkwa na ọ dịghị atụrụ dị nʼọgba anụ,
na ọ dịkwaghị ehi nọ nʼụlọ anụmanụ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.