Habakuk 2:6
Habakkuk 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya, “ ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi, ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’
Habakkuk 2:6 in English
Habakkuk 2:6 · Berean Standard Bible
Will not all of these take up a taunt against him, speaking with mockery and derision: ‘Woe to him who amasses what is not his and makes himself rich with many loans! How long will this go on?’
Context
4“Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu;
ọchịchọ ya ezikwaghị ezi
ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe* ya dị ndụ. 5Nʼezie, mmanya* na-eduhie ya ụzọ,
onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike.
Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ,
ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ.
Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya,
ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha. 6“Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya,
“ ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi,
ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya
site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’ 7Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede?
Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji?
Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ. 8Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche,
ndị ahụ fọdụrụ ga-abịakwa kwakọrọ ihe niile i nwere.
Nʼihi na ị wụsịala ọbara ndị mmadụ,
i bibiela ọtụtụ ala na obodo na ndị niile bi nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.