Habakuk 2:4
Habakkuk 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu; ọchịchọ ya ezikwaghị ezi ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe* ya dị ndụ.
Habakkuk 2:4 in English
Habakkuk 2:4 · Berean Standard Bible
Look at the proud one; his soul is not upright *— but the righteous will live by faith *—
Context
2Mgbe ahụ Onyenwe anyị zara m sị,
“Dee ọhụ* ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe.
Depụta ya nke ọma,
ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya. 3Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka,
ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ,
Ọ gaghị abụkwa ụgha.
Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya,
nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo,
ọ gaghị anọ tee aka. 4“Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu;
ọchịchọ ya ezikwaghị ezi
ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe* ya dị ndụ. 5Nʼezie, mmanya* na-eduhie ya ụzọ,
onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike.
Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ,
ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ.
Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya,
ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha. 6“Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya,
“ ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi,
ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya
site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.