Native Bible

Habakkuk 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu; ọchịchọ ya ezikwaghị ezi ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe* ya dị ndụ.

Habakkuk 2:4 in English

Habakkuk 2:4 · Berean Standard Bible

Look at the proud one; his soul is not upright *— but the righteous will live by faith *—

Context

2Mgbe ahụ Onyenwe anyị zara m sị, “Dee ọhụ* ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe. Depụta ya nke ọma, ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya. 3Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka, ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ, Ọ gaghị abụkwa ụgha. Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya, nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo, ọ gaghị anọ tee aka. 4“Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu; ọchịchọ ya ezikwaghị ezi ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe* ya dị ndụ. 5Nʼezie, mmanya* na-eduhie ya ụzọ, onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike. Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ, ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ. Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya, ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha. 6“Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya, “ ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi, ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.