Habakuk 2:3
Habakkuk 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka, ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ, Ọ gaghị abụkwa ụgha. Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya, nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo, ọ gaghị anọ tee aka.
Habakkuk 2:3 in English
Habakkuk 2:3 · Berean Standard Bible
For the vision awaits an appointed time; it testifies of the end and does not lie. Though it lingers, wait for it, since it will surely come and will not delay.*
Context
1Aga m arịgoro nʼelu ebe nche m,
guzo onwe m nʼebe nchekwa ahụ.
Aga m echerekwa ịhụ ihe ọ ga-agwa m,
na ihe m ga-asa, banyere mkpesa ndị a. 2Mgbe ahụ Onyenwe anyị zara m sị,
“Dee ọhụ* ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe.
Depụta ya nke ọma,
ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya. 3Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka,
ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ,
Ọ gaghị abụkwa ụgha.
Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya,
nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo,
ọ gaghị anọ tee aka. 4“Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu;
ọchịchọ ya ezikwaghị ezi
ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe* ya dị ndụ. 5Nʼezie, mmanya* na-eduhie ya ụzọ,
onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike.
Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ,
ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ.
Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya,
ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.