Native Bible

Habakkuk 2:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka, ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ, Ọ gaghị abụkwa ụgha. Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya, nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo, ọ gaghị anọ tee aka.

Habakkuk 2:3 in English

Habakkuk 2:3 · Berean Standard Bible

For the vision awaits an appointed time; it testifies of the end and does not lie. Though it lingers, wait for it, since it will surely come and will not delay.*

Context

1Aga m arịgoro nʼelu ebe nche m, guzo onwe m nʼebe nchekwa ahụ. Aga m echerekwa ịhụ ihe ọ ga-agwa m, na ihe m ga-asa, banyere mkpesa ndị a. 2Mgbe ahụ Onyenwe anyị zara m sị, “Dee ọhụ* ahụ nʼelu mbadamba nkume e ji ede ihe. Depụta ya nke ọma, ka onye na-agba ọsọ nwee ike ịgụ ya. 3Nʼihi na e nwere ọhụ nke ga-adị ruo oge a kara aka, ọ na-ekwu banyere oge ọgwụgwụ, Ọ gaghị abụkwa ụgha. Ọ bụrụ na ọ dịka mmezu ya adịghị abịaru ọsịịsọ, chere mmezu ya, nʼihi na ọ ga-emesịa mezuo, ọ gaghị anọ tee aka. 4“Lee, onye iro na-afụli onwe ya elu; ọchịchọ ya ezikwaghị ezi ma onye ezi omume ga-esite nʼokwukwe* ya dị ndụ. 5Nʼezie, mmanya* na-eduhie ya ụzọ, onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike. Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ, ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ. Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya, ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.