Habakuk 2:7
Habakkuk 2:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede? Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji? Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ.
Habakkuk 2:7 in English
Habakkuk 2:7 · Berean Standard Bible
Will not your creditors suddenly arise and those who disturb you awaken? Then you will become their prey.
Context
5Nʼezie, mmanya* na-eduhie ya ụzọ,
onye jupụtara na nganga, na-adịghị enwe ezumike.
Ebe ọ bụ na o nwere anya ukwu dịka ala mmụọ,
ọ gaghị enwekwa afọ ojuju dịka ọnwụ.
Nʼihi na ọ na-achịkọta mba niile nye onwe ya,
ọ na-adọtakwa ọtụtụ ndị mmadụ nʼagha. 6“Ndị a niile ha agaghị eji ịkwa emo na nkọcha sị ya,
“ ‘Ahụhụ dịrị onye ahụ na-atụkọta ihe e zutere nʼohi,
ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-eme onwe gị ọgaranya
site nʼịnara ndị mmadụ ụgwọ nʼike?’ 7Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede?
Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji?
Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ. 8Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche,
ndị ahụ fọdụrụ ga-abịakwa kwakọrọ ihe niile i nwere.
Nʼihi na ị wụsịala ọbara ndị mmadụ,
i bibiela ọtụtụ ala na obodo na ndị niile bi nʼime ha. 9“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ,
nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu,
nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.