Habakuk 2:9
Habakkuk 2:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ, nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu, nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa.
Habakkuk 2:9 in English
Habakkuk 2:9 · Berean Standard Bible
Woe to him who builds his house by unjust gain, to place his nest on high and escape the hand of disaster!
Context
7Ọ bụ na ndị i ji ụgwọ agaghị abịakwasị gị na mberede?
Ọ bụ na ha agaghị eteta nʼụra, mee gị ka ị maa jijiji?
Mgbe ahụ ka ha ga-eji gị mee ihe ha chọrọ. 8Nʼihi na ị kwakọtala akụ nke ọtụtụ mba dị iche iche,
ndị ahụ fọdụrụ ga-abịakwa kwakọrọ ihe niile i nwere.
Nʼihi na ị wụsịala ọbara ndị mmadụ,
i bibiela ọtụtụ ala na obodo na ndị niile bi nʼime ha. 9“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ,
nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu,
nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa. 10I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ,
sị otu a tufuo ndụ gị, ma wetakwara ezinaụlọ gị ihere. 11Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị.
Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.