Habakuk 2:11
Habakkuk 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị. Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ.
Habakkuk 2:11 in English
Habakkuk 2:11 · Berean Standard Bible
For the stones will cry out from the wall, and the rafters will echo it from the woodwork.
Context
9“Ahụhụ na-adịrị onye ahụ na-ewu ụlọ ya site nʼuru ọjọọ,
nke na-ewukwasị akwụ ya nʼebe dị elu,
nʼihi ịgbanarị mbibi nke ga-abịa. 10I sitela nʼizuzu ọjọọ gị mee ka mbibi bịakwasị ọtụtụ mmadụ,
sị otu a tufuo ndụ gị, ma wetakwara ezinaụlọ gị ihere. 11Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị.
Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ. 12“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo,
nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike. 13Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ,
na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.